Serialization of Naijiria, Mgbe Ochie Rue Taa, published in 2008 For Advanced Igbo Readers—series number 2

Serialization of Naijiria, Mgbe Ochie Rue Taa, published in 2008
For Advanced Igbo Readers—series number 2 ( for series number 1, login to the archives). 

Ndị Ọrọn na ndị Efik bụ nwanne. Ndị Ọrọn nabatara ndị ọcha n’obodo ha, mere ihe ndị ọcha jiri rụọ ụlọ akwụkwọ mpalite n’obodo Ọrọn n’afọ 1905.

Ndị Yoruba

N’ebe odịda anyanwu Naijiria dị, mba bi na ya bụ ndị Yoruba.

Otu akụkọ mgbe ochie sị na, ndị Yoruba si Mecca bia. Onye ndu

ha site Mecca bịaba ebe ala Yoruba dị na ya taa bụ Oduduwa. Nna

mụrụ Oduduwa bụ onye a na-akpọ Lamurudu.

Lamurudu bụ eze otu ebe dị n’akụkụ Mecca. Onwere oge nnukwu esemokwu bidoro n’etiti Lamurudu, nwa ya nwoke Oduduwa, na ndị Mecca gbasara okwukwe Alakụba. Esemokwu ahụ butere agha gburu Lamurudu. Oduduwa na ndị kwadoro ya na nna ya, a hapuzie Mecca. Ha e jegide ije, were rute Ile Ife. Ebe ahụ ka ha nodụziri, malite obodo

ohụrụ. Oduduwa mụrụ nwa nwoke a kpọrọ Ọkanbi, Ọkanbi a mụta

ụmụ nwanyi abụọ, na ụmụ nwoke ise. Ụmụ Ọkanbi bụ ndị bidoro

obodo asaa mbu dị n’ala ndị Yoruba. Aha obodo ndị a bụ: Owu,

Ketu, Benin, Ila, Sabe, Popo na Ọyọ.

Ndị Yoruba bụ agbụrụ nwere eze. Ha na-akpo eze ha ọba.

N’ime agbụrụ Yoruba, enwere ngalaba dị iche iche. Ẹnwere Egba,

nwekwaa Ijebu, Ibadan, Ekiti, Ondo, Eko, Ilọrin. Ngalaba niile

obodo ndị Yoruba, nwere eze nke ha. Ha niile na-eme ihe dị iche

iche maka ị kwalite ngalaba ha n’otu n’otu. Mana onwekwara oge

ha nwere nsogbu n’etiti ha niile. N’ime ngalaba niile ndị Yoruba,

Ile Ife bụ nke kachasị n’inweta nsọpuru ndị Yoruba niile, n’ihi na,

ala Ile Ife bụ ebe ndị Yoruba buru ụzọ biri mgbe ha batara n’ime

Naijiria.

Akụkọ mgbe ochie ndị Yoruba kwukwara sị na, onwere

ndị bibu n’Ile Ife, tupu ndị Yoruba a bata. Na, aha ndị ahụ, bụ ndị

Igbo (Ndị Igbo Ile Ife, na ndị Igbo bi n’ala Igbo abụghị otu

agbụrụ). Na, ndị Yoruba na onyeisi ha, aha ya bụ Oduduwa, si

n’ebe dị anya bịakwute ndị Igbo Ile Ife. Oduduwa na ndị Yoruba,

chụpụrụ ndị Igbo Ile Ife n’ala ha. Ndị Yoruba a nọdụzie n’Ile Ife,

Oduduwa abụrụzie eze ha.

Obodo Ile Ife bụ obodo mbụzọ ndị Yoruba, bụrụkwa obodo ha

niile na-enye nsọpụrụ karia obodo niile dị n’ala ndị Yoruba. Obodo

Ile Ife bụ isi ala ndị Yoruba site n’afọ 1100 rue n’afọ 1700. Ile Ife

mechara daa. Oge odịda ya mere ka obodo Ọyọ bụrụzie obodo

mbụzọ ndị Yoruba. Aha, a na-eto onyeisi obodo Ọyọ bụ Alaafin.

Ndị bụ Alaafin Ọyọ, nwere nnukwu ike n’oge Ọyọ bụ obodo

mbụzọ ndị Yoruba. Ike ha rutere ebe niile n’ala ndị Yoruba. N’ihi

na ike ha dị egwu, ha jiri ikike ha, were ya megide obodo ndị ọzọ

dị n’ala ndị Yoruba, dị ka Abeokuta, Ijebu na Ilọrin.

Agwa mmegbu, na mmegide bụ ihe wetara nnukwu nsogbu

n’ala ndị Yoruba, ha jiri bido lụsịba onwe ha ọgụ.

Ọgụ ha na-alụsị onwe ha, gwụrụ ha niile ike, wepụ ọtụtụ ihe n’ahụ ha niile, n’ihi na, ọgụ ndị a mefuru akụ na ụba ndị Yoruba, mekwaa ka ọtụtụ ụmụ nwoke ha, nwụọ n’ime ọgụ ndị a. Mgbe ike gwụrụ Oyo, obodo ndị ọzọ dị obere, enwee ike ị nọdụ, mana ọnọdụ ha esighi ike. Ihe ndị a, kpatara ndị Fulani jiri wepụta atụmatụ ị buso ndị Yoruba ọgụ.

Nkewa agha nwanne na nwanne dị n’etiti ndị Yoruba, mere ka ndị

Fulani, si n’ugwu Hausa gbadata buso ndị Yoruba agha. Ihe naakwa

ndị Fulani bụ, ka ha weta okwukwe Alakụba n’etiti ndị

Yoruba. Ha weta yabụ okwukwe ahụ, ndị Fulani abụrụ ndị isi

okwukwe ahụ.

Otu nwoke bụ ochiagha ndị agha niile ndị Yoruba, jiri maka

nkewa agha nwanne na nwanne ndị Yoruba, gbaa ha mgba okpuru.

Aha nwoke ahụ bụ Afọnja. Ya na ndị Fulani kwekọrịtara, na ha gaeme

enyi ga-abara yabụ Afọnja na ndị Fulani uru. Afọnja jiri obi

ya niile bata n’ime nkwekọrịta ahụ, n’ihi na ọ chọrọ ka ngalaba

Yoruba o si naya a-nakpọ Ilorin, nwee ike ị nọdụ onwe ya. Afọnja

na ọba obodo Ọyọ, nwere esemokwu n’oge ahụ. Oteghi aka,

Afọnja na ndị Fulani enwee esemokwu, ndị Fulani egbue ya. Mgbe

ha gbuchara Afọnja, ha e weta ọchịchị ndị Fulani n’etiti ndị Ilọrin.

Oge ndị Fulani wetara ọchịchị n’Ilorin, ha a-chọọ ị nubata na

ngalaba ndị ọzọ dị n’ala ndị Yoruba. Ndị Fulani na ndị Yoruba

lụgidere agha rue n’afọ 1843, mgbe ndị Yoruba meriri ndị Fulani

n’ime nnukwu agha, a lụrụ n’ ebe a na-akpọ Oshogbo. Etu a zi, ka

ndị Yoruba jiri kwụsị ndị Fulani ị weta ọchịchị ndị Fulani n’ala ndị

Yoruba niile.

Agbụrụ Bi Na Ndịda Naijiria

Agbụrụ bi na ndịda Naijiria hiri nne. Ndị soro biri n’ebe ahụ bụ

ndị Bini, Itshekiri, Urhobo, Isoko, Ishan, Izọn.

Ndị Bini

Otu akụkọ mgbe ochie ndị Bini, sị na obodo Bini malitere ebe

1000, na ọ bụ eze nke mbụ ndị Yoruba (Oduduwa), bụ onye zigara

nwa ya nwoke, aha ya bụ Ọranmiyan, ka ọ bụrụ eze ndị Bini.

Ọranmiyan rutere n’ala ndị Bini, bụrụ eze ha; mana, ka afọ naagafe,

ihe adabaghị Ọranmiyan na ndị Bini, n’ihi na ndị Bini bụ ndị

na-ewe iwe ọkụ. Oruzie otu ubọchị, Ọranmiyan a hapụ ala ndị

Bini, lọta n’Ile Ife. Mana tupu Ọranmiyan a hapụ ala ndị Bini,

onwere aha onyere ha: Aha ahụ n’asụsụ ndị Yoruba bụ “Ịle Ịbinu”

(nsụgharị ya n’asụsụ Igbo bụ “ala iwe”).

Onwere ndị ọzọ bụ ndị mmụta ihe mgbe ochie, kọrọ akụkọ

mmalite obodo ndị Bini n’uzọ dị iche. Ha sị, na onwere ụdị eze ndị

Bini nwere mgbe ochie a na-akpọ Ogiso. Ogiso nke iri atọ na isii,

nwere nwa nwoke aha ya bụ Ekaladerhan. Onwere arụsị ndị Bini

gwara ndị Bini, na ha chụpụ Ekaladerhan. Oge a chụpụrụ ya, ọ

gagide ije n’ime ọhịa, were rute Ile Ife, obodo ndị Yoruba. Tupu o

rute Ile Ife, arụsị ndị Ile Ife, gwara ha, na onwere onye ga-esi n’ime

ọhịa a bata, na onye ahụ ga-abụ eze ọhụrụ ndị Ile Ife. Ekaladerhan

batara n’ala Ile Ife, biri n’ebe ahụ. O ruru otu ụbọchị, ihe arụsị ahụ

kwuru e mee. Ndị Ile Ife mere Ekaladerhan eze, too ya “Ọọni Ile

Ife.” Ekaladerhan bịaziri gbanwee aha ya, zabazie Izoduwa.

Izoduwa bụ aha ndị Bini, Nkọwa ya n’asụsụ Igbo bụ “uzo akụ bụ

uzo masịrị m.” Izoduwa bụ onye ndị Yoruba na-akpọ Oduduwa.

Oge ụfọdụ, ha a-kpọọ ya Oodua, ma ọ bụ Eleduwa.

Ka afọ na-agafe, ndị Bini chegharịrị, were zita ndị mmadụ, ka

ha bịa rịọ Izoduwa, si ya lọta n’ala Bini bịa bụrụ eze. Mana ọ

gwara ha sị, ya agaghị emenwụ ya, n’ihi na, ya a bụrụla Ọọni Ile

Ife. Kama na, ọ gwara ha sị, na ya ga-ezipụta nwa ya nwoke bụ

Ọranmiyan ka ọ bịa bụrụ eze ha. Etu a zi ka Ọranmiyan siri bụrụ

eze ndị Bini.

Mgbe Ọranmiyan jiri iwe laghachịte Ile Ife, obere oge gafere, ọ

hapụ Ile Ife, jee bido obodo Ọyọ, bụrụ Alaafịn mbụzọ Ọyọ.

Ọba Ewuare na ọba Esigie, bụ ọba naabọ ndị Bini kachasị ibe

ha n’ọchịchị. N’oge Ewuare ka obodo Bini bụ nnukwu obodo, n’ihi

na, Ewuare nwere otu ndị agha siri nnukwu ike. Ha meriri ọtụtụ

mba dị iche iche. Ọchịchị ndị Bini rutekwara ụfọdụ ebe ndị Igbo bi

na ya, dị ka, Agbọr, Isele Ukwu, na Ọgwashi Ukwu. N’oge

Ewuare, ka ọ gbanwere aha “Ile Ibinu” Ọranmiyan kpọrọ ndị Bini,

kpọbazie ha ndị “Edo.”

N’oge ọba Esigie, ka ndị ọcha (ndị si obodo Portugal) bịara n’ala

Edo. Ha na ọba Esigie nwere ezigbo nghọta, mere ka Esigie ziga

onye nke ya n’ala ndị Portugal. Ndị ọcha Portugal, na ndị Edo

nwekwara mmekọ azụmahịa: ndị Edo na-eresị ndị Portugal

mmadụ, ose, mpi enyi, na ihe ndị ọzọ, ndị Portugal a na-eresi ndị

Edo egbe, mmanya ike (whiskey), akwụkwọ ụtaba/anwụrụ, na ihe

ndị ọzọ. Aha nne ọba Esigie bụ nneọba Idia. Nneọba Idia, bụ

nwanyị nwere nnukwu ike, ndị mmadụ na-atụrụ nnukwu egwu,

maka ike onwere n’ilụ agha, ma n’igwọ ọgwụ. Ihu mmanwụ

FESTAC bụ ihụ nneọba Esigie.

Obodo Bini, obodo ndị Edo, mechara daa n’oge ndị ọcha ndị

British batara. Ọba Overhamwen jụrụ ajụ, na ya-agaghị a nabata

ọchịchị ndị British n’ala Bini. Nnukwu esemokwu mere n’etiti ọba,

na ndị British, mgbe e gburu mmadụ asatọ, na onye ndu ha bụ

onye ọcha, na-ejere ndị British ozi n’ala Bini. N’ihi ya, ka Admiral

Sir Harry Rawson, na ndị agha ndị British, jiri buso ala Bini agha,

gbaa Bini ọkụ, chụpụ ọba Overhamwen, wetazie ọchịchị ndị

British n’ala Bini.